Native Bible

Psalms 76 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 76
1A maara Chineke nʼobodo Juda; aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel. 2Ụlọ ikwu ya dị na Salem, ebe obibi ya dị na Zayọn 3Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma, na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela 4Ị jupụtara nʼìhè, ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara. 5A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha, ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha; o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a pụrụ iweli aka ya abụọ elu. 6Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb, ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.* 7Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe? 8I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị. Ụwa tụkwara egwu, dere duu, 9mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe, ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela 10Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,* ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu. 11Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha; ka ndị ala niile bụ agbataobi unu wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche. 12Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala; ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu. 76:6 Ọpụ 15:1-6 76:10 Ọpụ 9:16-18; Rom 9:17

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.