Abụ Ọma 76
Psalms 76 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1A maara Chineke nʼobodo Juda;
aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel. 2Ụlọ ikwu ya dị na Salem,
ebe obibi ya dị na Zayọn 3Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma,
na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela 4Ị jupụtara nʼìhè,
ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara. 5A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha,
ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha;
o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a
pụrụ iweli aka ya abụọ elu. 6Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb,
ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.* 7Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe? 8I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị.
Ụwa tụkwara egwu, dere duu, 9mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe,
ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela 10Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,*
ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu. 11Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha;
ka ndị ala niile bụ agbataobi unu
wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche. 12Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala;
ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.
76:6 Ọpụ 15:1-6
76:10 Ọpụ 9:16-18; Rom 9:17
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.