Abụ Ọma 76:5
Psalms 76:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha, ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha; o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a pụrụ iweli aka ya abụọ elu.
Psalms 76:5 in English
Psalms 76:5 · Berean Standard Bible
The valiant lie plundered; they sleep their last sleep. No men of might could lift a hand.
Context
3Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma,
na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela 4Ị jupụtara nʼìhè,
ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara. 5A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha,
ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha;
o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a
pụrụ iweli aka ya abụọ elu. 6Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb,
ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.* 7Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.