Abụ Ọma 77
Psalms 77 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka;
etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m. 2Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ.
Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị,
mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi. 3O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude;
echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. Sela 4I kweghị ka anya m abụọ mechie;
nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu. 5Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga,
na afọ niile ndị gara aga. 6Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị.
Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ. 7“Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi?
Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ? 8Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla?
Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi? 9Chineke, o chefuola i mere anyị ebere?
O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” Sela 10Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m,
afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya. 11Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;
e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga. 12Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,
tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.” 13O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ.
Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị? 14Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche;
ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ. 15I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị,
bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. Sela 16Osimiri hụrụ gị, O Chineke,
osimiri hụrụ gị, taa;
ogbu mmiri mere mkpọtụ. 17Igwe ojii wụpụrụ mmiri,
mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe;
àkụ gị gburu amụma ebe niile. 18A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe,
amụma gị nyere ụwa niile ihe;
elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu. 19Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara,
ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri,
ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya. 20I sitere nʼaka Mosis na Erọn
duo ndị gị dịka igwe atụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.