Native Bible

Psalms 77:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Igwe ojii wụpụrụ mmiri, mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe; àkụ gị gburu amụma ebe niile.

Psalms 77:17 in English

Psalms 77:17 · Berean Standard Bible

The clouds poured down water; the skies resounded with thunder; Your arrows flashed back and forth.

Context

15I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị, bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. Sela 16Osimiri hụrụ gị, O Chineke, osimiri hụrụ gị, taa; ogbu mmiri mere mkpọtụ. 17Igwe ojii wụpụrụ mmiri, mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe; àkụ gị gburu amụma ebe niile. 18A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe, amụma gị nyere ụwa niile ihe; elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu. 19Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara, ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri, ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.