Native Bible

Psalms 77:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude; echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. Sela

Psalms 77:3 in English

Psalms 77:3 · Berean Standard Bible

I remembered You, O God, and I groaned; I mused and my spirit grew faint. Selah

Context

1Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka; etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m. 2Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ. Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị, mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi. 3O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude; echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. Sela 4I kweghị ka anya m abụọ mechie; nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu. 5Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga, na afọ niile ndị gara aga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.