Abụ Ọma 33
Psalms 33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;
nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya. 2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;
werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. 3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;
were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ. 4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;
o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. 5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya;
ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. 6Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile,
jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile. 7Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe,
kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu. 8Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu;
ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya. 9Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara;
o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm. 10Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile;
ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ. 11Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ebumnobi ya ruo ọgbọ niile. 12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha;
bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya. 13Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya.
Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya. 14O sitere nʼebe obibi ya na-ele
onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya. 15Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu;
ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme. 16Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya;
o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya. 17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.
Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha. 18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,
ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.
Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ. 20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;
ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị. 21Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya;
nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi. 22O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị,
dịka olileanya anyị dị na gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.