Abụ Ọma 33:19
Psalms 33:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
Psalms 33:19 in English
Psalms 33:19 · Berean Standard Bible
to deliver them from death and keep them alive in famine.
Context
17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.
Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha. 18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,
ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.
Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ. 20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;
ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị. 21Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya;
nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.