Abụ Ọma 33:17
Psalms 33:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha. Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.
Psalms 33:17 in English
Psalms 33:17 · Berean Standard Bible
A horse is a vain hope for salvation; even its great strength cannot save.
Context
15Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu;
ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme. 16Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya;
o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya. 17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.
Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha. 18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,
ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.
Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.