Abụ Ọma 33:15
Psalms 33:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.
Psalms 33:15 in English
Psalms 33:15 · Berean Standard Bible
He shapes the hearts of each; He considers all their works.
Context
13Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya.
Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya. 14O sitere nʼebe obibi ya na-ele
onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya. 15Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu;
ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme. 16Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya;
o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya. 17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.
Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.