Native Bible

Psalms 33:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O sitere nʼebe obibi ya na-ele onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.

Psalms 33:14 in English

Psalms 33:14 · Berean Standard Bible

From His dwelling place He gazes on all who inhabit the earth.

Context

12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya. 13Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya. 14O sitere nʼebe obibi ya na-ele onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya. 15Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme. 16Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya; o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.