Abụ Ọma 32
Psalms 32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ,
onye a gbaghaara ajọ omume ya niile,
onye e kpuchikwaara mmehie ya niile. 2Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,
onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya,
onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya. 3Mgbe m gbachiri nkịtị,
ọkpụkpụ m rere ure
site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile. 4Ehihie niile na abalị niile,
ị tara m ahụhụ,
ume dị m nʼobi gwụchara,
dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị.* Sela 5Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,
kwụsịkwa izo ha ezo.
Agwara m onwe m okwu sị,
“Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.”
Ị gbaghakwaara m
ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela 6Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere
mgbe e nwere ike ịchọta gị;
nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,
ọ gaghị erute ha. 7Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;
Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.
Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela 8Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;
Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị. 9Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu
nke na-enweghị akọnuche,
nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya,
ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị. 10Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ,
ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ,
na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu. 11Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;
bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.
32:4 Mgbe anwụ na-amịkọrọ mmiri dị nʼala
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.