Abụ Ọma 32:6
Psalms 32:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere mgbe e nwere ike ịchọta gị; nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, ọ gaghị erute ha.
Psalms 32:6 in English
Psalms 32:6 · Berean Standard Bible
Therefore let all the godly pray to You while You may be found. Surely when great waters rise, they will not come near.
Context
4Ehihie niile na abalị niile,
ị tara m ahụhụ,
ume dị m nʼobi gwụchara,
dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị.* Sela 5Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,
kwụsịkwa izo ha ezo.
Agwara m onwe m okwu sị,
“Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.”
Ị gbaghakwaara m
ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela 6Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere
mgbe e nwere ike ịchọta gị;
nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,
ọ gaghị erute ha. 7Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;
Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.
Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela 8Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;
Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.