Abụ Ọma 32:8
Psalms 32:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso; Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
Psalms 32:8 in English
Psalms 32:8 · Berean Standard Bible
I will instruct you and teach you the way you should go; I will give you counsel and watch over you.
Context
6Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere
mgbe e nwere ike ịchọta gị;
nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,
ọ gaghị erute ha. 7Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;
Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.
Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela 8Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;
Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị. 9Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu
nke na-enweghị akọnuche,
nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya,
ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị. 10Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ,
ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ,
na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.