Abụ Ọma 32:9
Psalms 32:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu nke na-enweghị akọnuche, nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya, ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.
Psalms 32:9 in English
Psalms 32:9 · Berean Standard Bible
Do not be like the horse or mule, which have no understanding; they must be controlled with bit and bridle to make them come to you.
Context
7Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;
Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.
Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela 8Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;
Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị. 9Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu
nke na-enweghị akọnuche,
nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya,
ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị. 10Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ,
ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ,
na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu. 11Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;
bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.
32:4 Mgbe anwụ na-amịkọrọ mmiri dị nʼala
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.