Abụ Ọma 32:5
Psalms 32:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
Psalms 32:5 in English
Psalms 32:5 · Berean Standard Bible
Then I acknowledged my sin to You and did not hide my iniquity. I said, “I will confess my transgressions to the LORD,” and You forgave the guilt of my sin. Selah
Context
3Mgbe m gbachiri nkịtị,
ọkpụkpụ m rere ure
site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile. 4Ehihie niile na abalị niile,
ị tara m ahụhụ,
ume dị m nʼobi gwụchara,
dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị.* Sela 5Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,
kwụsịkwa izo ha ezo.
Agwara m onwe m okwu sị,
“Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.”
Ị gbaghakwaara m
ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela 6Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere
mgbe e nwere ike ịchọta gị;
nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,
ọ gaghị erute ha. 7Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;
Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.
Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.