Abụ Ọma 32:4
Psalms 32:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ehihie niile na abalị niile, ị tara m ahụhụ, ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị.* Sela
Psalms 32:4 in English
Psalms 32:4 · Berean Standard Bible
For day and night Your hand was heavy upon me; my strength was drained * as in the summer heat. Selah
Context
2Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,
onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya,
onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya. 3Mgbe m gbachiri nkịtị,
ọkpụkpụ m rere ure
site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile. 4Ehihie niile na abalị niile,
ị tara m ahụhụ,
ume dị m nʼobi gwụchara,
dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị.* Sela 5Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,
kwụsịkwa izo ha ezo.
Agwara m onwe m okwu sị,
“Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.”
Ị gbaghakwaara m
ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela 6Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere
mgbe e nwere ike ịchọta gị;
nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,
ọ gaghị erute ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.