Abụ Ọma 31
Psalms 31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ;
ekwela ka ihere* mee m;
site nʼezi omume gị gbapụta m. 2Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m,
bịa ngwangwa gbapụta m;
ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,
ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m. 3Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike,
nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m. 4Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m,
nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike. 5Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m;
gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu. 6Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru;
ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m. 7Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị,
nʼihi na ị hụrụ nsogbu m
marakwa ihe mgbu nke mmụọ m. 8I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m,
kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ. 9O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m.
Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa;
ike adịghịkwa m. 10Iru ụjụ eriela m ahụ;
ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m;
ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m
ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m. 11Nʼihi ndị iro m niile;
ndị agbataobi m na-elelị m anya.
Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m,
ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee. 12Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ.
A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m. 13Anụla m nkwulu ha megide m;
oke egwu dị nʼakụkụ niile;
ha na-agba izu megide m,
na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m. 14Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị.
Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.” 15Oge m niile dị gị nʼaka.
Napụta m nʼaka ndị iro m
na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ. 16Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ;
zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ. 17O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m,
nʼihi na akpọkuola m gị;
kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ,
ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. 18Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam;
nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị
ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume. 19Lee ka ịdị mma gị si baa ụba,
nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị,
nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị,
nʼihu ọha mmadụ. 20I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị
pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ;
ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị;
ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche. 21Otuto dịrị Onyenwe anyị
nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu
mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu. 22Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị,
“Ewezugala m site nʼihu ya!”
Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere
mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka. 23Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi,
nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya,
ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu. 24Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,
unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.
31:1 Ihere Maọbụ, ihe na-eweta ọnụma ma ọ bụkwanụ, ọnọdụ ịkwa emo
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.