Native Bible

Psalms 31:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ.

Psalms 31:19 in English

Psalms 31:19 · Berean Standard Bible

How great is Your goodness which You have laid up for those who fear You, which You have bestowed before the sons of men on those who take refuge in You!

Context

17O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m, nʼihi na akpọkuola m gị; kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. 18Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam; nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume. 19Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ. 20I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche. 21Otuto dịrị Onyenwe anyị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.