Abụ Ọma 31:9
Psalms 31:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m. Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa; ike adịghịkwa m.
Psalms 31:9 in English
Psalms 31:9 · Berean Standard Bible
Be merciful to me, O LORD, for I am in distress; my eyes fail from sorrow, my soul and body as well.
Context
7Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị,
nʼihi na ị hụrụ nsogbu m
marakwa ihe mgbu nke mmụọ m. 8I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m,
kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ. 9O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m.
Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa;
ike adịghịkwa m. 10Iru ụjụ eriela m ahụ;
ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m;
ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m
ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m. 11Nʼihi ndị iro m niile;
ndị agbataobi m na-elelị m anya.
Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m,
ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.