Abụ Ọma 31:8
Psalms 31:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m, kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.
Psalms 31:8 in English
Psalms 31:8 · Berean Standard Bible
You have not delivered me to the enemy; You have set my feet in the open.
Context
6Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru;
ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m. 7Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị,
nʼihi na ị hụrụ nsogbu m
marakwa ihe mgbu nke mmụọ m. 8I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m,
kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ. 9O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m.
Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa;
ike adịghịkwa m. 10Iru ụjụ eriela m ahụ;
ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m;
ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m
ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.