Native Bible

Psalms 31:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.

Psalms 31:2 in English

Psalms 31:2 · Berean Standard Bible

Incline Your ear to me; come quickly to my rescue. Be my rock of refuge, the stronghold of my deliverance.

Context

1Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere* mee m; site nʼezi omume gị gbapụta m. 2Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m. 3Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m. 4Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.