Native Bible

Psalms 31:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.

Psalms 31:13 in English

Psalms 31:13 · Berean Standard Bible

For I hear the slander of many; there is terror on every side. They conspire against me and plot to take my life.

Context

11Nʼihi ndị iro m niile; ndị agbataobi m na-elelị m anya. Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m, ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee. 12Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ. A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m. 13Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m. 14Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị. Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.” 15Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.