Abụ Ọma 33:2
Psalms 33:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.
Psalms 33:2 in English
Psalms 33:2 · Berean Standard Bible
Praise the LORD with the harp; make music to Him with ten strings.
Context
1Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;
nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya. 2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;
werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. 3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;
were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ. 4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;
o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.