Abụ Ọma 33:4
Psalms 33:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.
Psalms 33:4 in English
Psalms 33:4 · Berean Standard Bible
For the word of the LORD is upright, and all His work is trustworthy.
Context
2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;
werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. 3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;
were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ. 4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;
o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. 5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya;
ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. 6Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile,
jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.