Abụ Ọma 33:6
Psalms 33:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.
Psalms 33:6 in English
Psalms 33:6 · Berean Standard Bible
By the word of the LORD the heavens were made, and all the stars by the breath of His mouth.
Context
4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;
o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. 5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya;
ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. 6Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile,
jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile. 7Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe,
kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu. 8Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu;
ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.