Native Bible

Psalms 20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 20
1Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị. 2Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, ma site na Zayọn kwagide gị. 3Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela 4Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. 5Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile. 6Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, zọpụta ma zakwaa ya. 7Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi. 8Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa, ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm. 9O Onyenwe anyị, zọpụta eze! Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.