Abụ Ọma 20
Psalms 20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị;
ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị. 2Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,
ma site na Zayọn kwagide gị. 3Ya chetakwa aja niile ị chụrụ,
ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela 4Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,
mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. 5Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri,
buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị.
Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile. 6Ugbu a, amaara m
na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ;
ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya,
zọpụta ma zakwaa ya. 7Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha;
ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi. 8Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa,
ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm. 9O Onyenwe anyị, zọpụta eze!
Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.