Native Bible

Psalms 20:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.

Psalms 20:7 in English

Psalms 20:7 · Berean Standard Bible

Some trust in chariots and others in horses, but we trust in the name of the LORD our God.

Context

5Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile. 6Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, zọpụta ma zakwaa ya. 7Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi. 8Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa, ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm. 9O Onyenwe anyị, zọpụta eze! Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.