Abụ Ọma 20:6
Psalms 20:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, zọpụta ma zakwaa ya.
Psalms 20:6 in English
Psalms 20:6 · Berean Standard Bible
Now I know that the LORD saves His anointed; He answers him from His holy heaven with the saving power of His right hand.
Context
4Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,
mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. 5Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri,
buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị.
Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile. 6Ugbu a, amaara m
na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ;
ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya,
zọpụta ma zakwaa ya. 7Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha;
ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi. 8Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa,
ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.