Abụ Ọma 20:5
Psalms 20:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.
Psalms 20:5 in English
Psalms 20:5 · Berean Standard Bible
May we shout for joy at your victory and raise a banner in the name of our God. May the LORD grant all your petitions.
Context
3Ya chetakwa aja niile ị chụrụ,
ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela 4Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,
mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. 5Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri,
buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị.
Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile. 6Ugbu a, amaara m
na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ;
ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya,
zọpụta ma zakwaa ya. 7Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha;
ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.