Abụ Ọma 20:4
Psalms 20:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.
Psalms 20:4 in English
Psalms 20:4 · Berean Standard Bible
May He give you the desires of your heart and make all your plans succeed.
Context
2Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,
ma site na Zayọn kwagide gị. 3Ya chetakwa aja niile ị chụrụ,
ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela 4Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,
mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. 5Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri,
buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị.
Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile. 6Ugbu a, amaara m
na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ;
ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya,
zọpụta ma zakwaa ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.