Abụ Ọma 20:3
Psalms 20:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela
Psalms 20:3 in English
Psalms 20:3 · Berean Standard Bible
May He remember all your gifts and look favorably on your burnt offerings. Selah
Context
1Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị;
ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị. 2Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,
ma site na Zayọn kwagide gị. 3Ya chetakwa aja niile ị chụrụ,
ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela 4Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,
mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. 5Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri,
buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị.
Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.