Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Job zara sị: 2“Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.
Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke? 3Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,
ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya? 4Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,
onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ? 5Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a,
na-akwatụ ha nʼiwe ya. 6Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,
mee ka ogidi ya maa jijiji. 7Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;
ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye. 8Naanị ya gbasara mbara eluigwe,
ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri. 9Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion
na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe. 10Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,
ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta. 11Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya,
mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya. 12Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya?
Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’ 13Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi,
ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya. 14“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ,
maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka? 15Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu;
kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere. 16A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m,
ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị. 17Ọ ga-eji oke ifufe tirie m,
meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya. 18Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi
kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m. 19Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu!
Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya. 20A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe;
ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara. 21“Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị
ejighị m onwe m kpọrọ ihe;
nʼezie ana m eleda ndụ m anya. 22Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị,
‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’ 23Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede,
ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị. 24Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu,
ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya.
Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya? 25“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;
ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya. 26Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,*
dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri. 27Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,
aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’ 28Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu
nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha. 29Ebe m bụrịị onye ikpe mara,
nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu? 30A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m
werekwa soda saa aka m abụọ, 31ị ga-enuba m nʼolulu apịtị
nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị. 32“Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya,
ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe. 33A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị,
onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya, 34onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ,
ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ. 35Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu;
ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.
9:26 Ọ bụ nʼIjipt ka a na-eji ahịhịa papịrọs arụ ụgbọ epeepe. Ọpụ 2:3
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.