Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, ‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’

Job 9:22 in English

Job 9:22 · Berean Standard Bible

It is all the same, and so I say, ‘He destroys both the blameless and the wicked.’

Context

20A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara. 21“Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị ejighị m onwe m kpọrọ ihe; nʼezie ana m eleda ndụ m anya. 22Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, ‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’ 23Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede, ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị. 24Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.