Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị: 2“Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a?
Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike. 3Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?
Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ? 4Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya,
o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha. 5Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike,
rịọ Onye pụrụ ime ihe niile, 6ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi,
ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị
weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị. 7Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala,
ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu. 8“Jụọ ọgbọ ndị gara aga
ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara. 9Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara.
Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo. 10Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe?
Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu? 11Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị?
Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị? 12Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha,
ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ. 13Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,
otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi. 14Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;
ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide. 15Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;
ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa. 16Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,
nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ. 17Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,
ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a. 18Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,
ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’ 19Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ,
site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa. 20“Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ,
maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume. 21Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị.
Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta. 22Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe,
ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.