Job 8:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi; ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa.
Job 8:15 in English
Job 8:15 · Berean Standard Bible
He leans on his web, but it gives way; he holds fast, but it does not endure.
Context
13Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,
otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi. 14Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;
ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide. 15Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;
ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa. 16Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,
nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ. 17Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,
ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.