Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ, ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.

Job 8:17 in English

Job 8:17 · Berean Standard Bible

His roots wrap around the rock heap; he looks for a home among the stones.

Context

15Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi; ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa. 16Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị, nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ. 17Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ, ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a. 18Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya, ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’ 19Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ, site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.