Job 8:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ, ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.
Job 8:17 in English
Job 8:17 · Berean Standard Bible
His roots wrap around the rock heap; he looks for a home among the stones.
Context
15Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;
ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa. 16Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,
nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ. 17Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,
ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a. 18Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,
ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’ 19Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ,
site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.