Job 8:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị, nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.
Job 8:16 in English
Job 8:16 · Berean Standard Bible
He is a well-watered plant in the sunshine, spreading its shoots over the garden.
Context
14Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;
ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide. 15Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;
ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa. 16Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,
nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ. 17Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,
ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a. 18Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,
ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.