Job 8:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa; ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.
Job 8:14 in English
Job 8:14 · Berean Standard Bible
His confidence is fragile; his security is in a spider’s web.
Context
12Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha,
ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ. 13Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,
otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi. 14Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;
ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide. 15Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;
ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa. 16Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,
nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.