Job 8:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha, ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.
Job 8:12 in English
Job 8:12 · Berean Standard Bible
While the shoots are still uncut, they dry up quicker than grass.
Context
10Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe?
Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu? 11Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị?
Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị? 12Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha,
ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ. 13Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,
otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi. 14Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;
ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.