Job 8:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ, site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.
Job 8:19 in English
Job 8:19 · Berean Standard Bible
Surely this is the joy of his way; yet others will spring from the dust.
Context
17Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,
ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a. 18Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,
ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’ 19Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ,
site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa. 20“Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ,
maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume. 21Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị.
Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.