Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.
Job 9:8 in English
Job 9:8 · Berean Standard Bible
He alone stretches out the heavens and treads on the waves of the sea.
Context
6Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,
mee ka ogidi ya maa jijiji. 7Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;
ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye. 8Naanị ya gbasara mbara eluigwe,
ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri. 9Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion
na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe. 10Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,
ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.