Job 9:27
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’
Job 9:27 in English
Job 9:27 · Berean Standard Bible
If I were to say, ‘I will forget my complaint and change my expression and smile,’
Context
25“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;
ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya. 26Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,*
dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri. 27Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,
aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’ 28Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu
nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha. 29Ebe m bụrịị onye ikpe mara,
nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.