Aịzaya 56
Isaiah 56 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị,
“Debenụ ikpe ziri ezi,
meekwanụ ihe ziri ezi.
Nʼihi na nzọpụta m dị nso,
ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya. 2Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a,
bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike,
onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya,
nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.” 3Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị,
“Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.”
Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị
“Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.” 4Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile,
ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ,
na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike. 5Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya,
ihe ncheta na aha
dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi
nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi. 6Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị
ijere ya ozi,
na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya,
nakwa ị bụ ndị ohu ya,
ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya,
na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike, 7ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m,
meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m.
Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere
nʼebe ịchụ aja m.
Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m
Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.” 8Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara,
bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta,
“Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha
tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.” 9Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa.
Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa. 10Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì.
Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ.
Ha dị ka nkịta dara ogbi,
nke na-adịghị agbọ ụja.
Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ,
na idina ndina nʼanya. 11Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke;
ha adịghị enwe afọ ojuju.
Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta,
ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha,
onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya. 12Onye ọbụla na-asị, “Bịa ka m weta mmanya,
ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị.
Echi ga-adịkwa ka taa,
ma ọ bụkwanụ dị mma karịa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.