Aịzaya 56:5
Isaiah 56:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya, ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi.
Isaiah 56:5 in English
Isaiah 56:5 · Berean Standard Bible
I will give them, in My house and within My walls, a memorial and a name better than that of sons and daughters. I will give them an everlasting name that will not be cut off.
Context
3Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị,
“Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.”
Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị
“Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.” 4Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile,
ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ,
na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike. 5Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya,
ihe ncheta na aha
dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi
nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi. 6Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị
ijere ya ozi,
na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya,
nakwa ị bụ ndị ohu ya,
ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya,
na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike, 7ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m,
meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m.
Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere
nʼebe ịchụ aja m.
Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m
Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.