Native Bible

Isaiah 56:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị ijere ya ozi, na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya, nakwa ị bụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya, na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,

Isaiah 56:6 in English

Isaiah 56:6 · Berean Standard Bible

And the foreigners who join themselves to the LORD to minister to Him, to love the name of the LORD, and to be His servants— all who keep the Sabbath without profaning it and who hold fast to My covenant—

Context

4Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike. 5Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya, ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi. 6Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị ijere ya ozi, na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya, nakwa ị bụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya, na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike, 7ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m. Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere nʼebe ịchụ aja m. Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.” 8Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta, “Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.