Aịzaya 56:4
Isaiah 56:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.
Isaiah 56:4 in English
Isaiah 56:4 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD says: “To the eunuchs who keep My Sabbaths, who choose what pleases Me and hold fast to My covenant—
Context
2Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a,
bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike,
onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya,
nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.” 3Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị,
“Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.”
Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị
“Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.” 4Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile,
ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ,
na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike. 5Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya,
ihe ncheta na aha
dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi
nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi. 6Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị
ijere ya ozi,
na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya,
nakwa ị bụ ndị ohu ya,
ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya,
na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.