Aịzaya 56:3
Isaiah 56:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị, “Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị “Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”
Isaiah 56:3 in English
Isaiah 56:3 · Berean Standard Bible
Let no foreigner who has joined himself to the LORD say, “The LORD will utterly exclude me from His people.” And let the eunuch not say, “I am but a dry tree.”
Context
1Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị,
“Debenụ ikpe ziri ezi,
meekwanụ ihe ziri ezi.
Nʼihi na nzọpụta m dị nso,
ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya. 2Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a,
bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike,
onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya,
nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.” 3Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị,
“Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.”
Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị
“Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.” 4Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile,
ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ,
na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike. 5Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya,
ihe ncheta na aha
dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi
nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.