Aịzaya 56:2
Isaiah 56:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a, bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike, onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya, nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.”
Isaiah 56:2 in English
Isaiah 56:2 · Berean Standard Bible
Blessed is the man who does this, and the son of man who holds it fast, who keeps the Sabbath without profaning it and keeps his hand from doing any evil.”
Context
1Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị,
“Debenụ ikpe ziri ezi,
meekwanụ ihe ziri ezi.
Nʼihi na nzọpụta m dị nso,
ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya. 2Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a,
bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike,
onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya,
nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.” 3Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị,
“Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.”
Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị
“Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.” 4Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru:
“Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile,
ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ,
na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.