Aịzaya 56:8
Isaiah 56:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta, “Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”
Isaiah 56:8 in English
Isaiah 56:8 · Berean Standard Bible
Thus declares the Lord GOD, who gathers the dispersed of Israel: “I will gather to them still others besides those already gathered.”
Context
6Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị
ijere ya ozi,
na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya,
nakwa ị bụ ndị ohu ya,
ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya,
na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike, 7ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m,
meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m.
Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere
nʼebe ịchụ aja m.
Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m
Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.” 8Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara,
bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta,
“Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha
tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.” 9Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa.
Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa. 10Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì.
Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ.
Ha dị ka nkịta dara ogbi,
nke na-adịghị agbọ ụja.
Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ,
na idina ndina nʼanya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.