Aịzaya 56:10
Isaiah 56:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya.
Isaiah 56:10 in English
Isaiah 56:10 · Berean Standard Bible
Israel’s watchmen are blind, they are all oblivious; they are all mute dogs, they cannot bark; they are dreamers lying around, loving to slumber.
Context
8Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara,
bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta,
“Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha
tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.” 9Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa.
Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa. 10Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì.
Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ.
Ha dị ka nkịta dara ogbi,
nke na-adịghị agbọ ụja.
Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ,
na idina ndina nʼanya. 11Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke;
ha adịghị enwe afọ ojuju.
Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta,
ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha,
onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya. 12Onye ọbụla na-asị, “Bịa ka m weta mmanya,
ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị.
Echi ga-adịkwa ka taa,
ma ọ bụkwanụ dị mma karịa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.